Isaiah 55

Bịanụ ndị akpịrị na-akpọ nkụ

1Gee ntị, bịa onye ọbụla akpịrị na-akpọ nkụ,
bịanụ na mmiri,
unu ndị na-enweghị ego
bịanụ zụọ, riekwa.
Bịanụ, zuru mmanya na mmiri ara ehi
na-ejighị ego na-arụghị ọnụahịa ọbụla.
2Nʼihi gịnị ka i ji na-atụfu ego gị ịzụ ihe na-abụghị ezi nri?
Gịnị mere i ji na-adọgbu onwe gị nʼọrụ nʼihe na-apụghị iju gị afọ?
Gee ntị, geenụ m ntị nke ọma, rie ezigbo nri
mkpụrụobi gị ga-enwe afọ ojuju na nri dị ezi mma!
3“Tọọnụ ntị unu nʼala, bịakwute m!
Gee ntị, ka inwe ike dị ndụ.
Mụ na unu ga-aba nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi,
bụ ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi nke m kwere Devid na nkwa.
4Lee, emere m ya ka ọ ghọọrọ ndị niile dị iche iche onyeama,
ka ọ bụrụ onyendu na onyeisi ọchịchị nye ndị niile dị iche iche.
5Nʼezie, gị onwe gị ga-akpọku mba dị iche iche na i maghị,
mba ndị ahụ na-amaghị gị ga-ejikwa ọsọ gbakwute gị,
nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị,
Onye nsọ nke Izrel,
nʼihi na o meela ka ị bụrụ ihe dị oke mma.”

6Chọọnụ Onyenwe anyị mgbe a ga-achọta ya.
Kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso.
7Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya,
ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile.
Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere,
ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile.

8“Nʼihi na echiche m ha abụghị echiche unu,
ụzọ unu niile, ha abụkwaghị ụzọ m,”
ka Onyenwe anyị kwupụtara.
9“Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa,
otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile,
otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile.
10Dịka mmiri na mkpụrụ mmiri
si esi nʼeluigwe ada nʼụwa
na-alaghachighị nʼeluigwe
ma ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala,
mee ka ihe ubi pupụta, too eto,
meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri.
11Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị.
Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu.
Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee,
baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya.
12Nʼihi na unu ga-eji ọṅụ pụọ,
a ga-esikwa nʼebe ahụ dupụta unu nʼudo.
Ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile
na osisi niile nke ubi,
ga-eti mkpu ọṅụ,
kụọkwa aka nʼobi ụtọ.
13Ebe ogwu na-eto na mbụ, osisi junipa ga-eto na ya;
ebe uke toro, osisi mietul ga-eto na ya.
Ihe ndị a ga-aghọrọ Onyenwe anyị aha dị ukwuu,
nke ga-abụkwa ihe ịrịbama
ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.”
Copyright information for IboBIU